Créditos

KOMPOSITION UND LIEDTEXT
Okoye Onyeka favour
Okoye Onyeka favour
Songwriter:in

Letras

Ife niine ị jụlụ mụ, ị ma na ị jụbugo m nya? (Nekwa ajụjụ)
Onye ajụjụ ee, i jụgbue m oo (Nekwa ajụjụ)
Ajụjụ niine ị na-ajụ, onye ga-aza gị ya? (Nekwa ajụjụ)
Chei, ọjụgọọ m aka oo, ọ jụgbue m oo (Nekwa ajụjụ)
Ị fụlụ m n'ụtụtụ, jụọ m, "Ị pụtago ụla?" (Nekwa ajụjụ oo)
Ị nụ na mmadụ nwụlụ, ị jụọ, "Kedụ ife gbulu ya?" (Nekwa ajụjụ)
"Phyno na Flavour, ọ bụ onye kadị nwee ego?" (Nekwa ajụjụ)
A jụọ m, "Bobrisky, ọ kwa ọ bụ nwoke o?" (Nekwa ajụjụ)
Chei, "Michael Jackson, asị na ọ na-ete ude?" (Nekwa ajụjụ)
Ị fụlụ mụ na pastor, jụba m, "Ọ dịkwa na mma?" (Nekwa ajụjụ)
"Motor Chukwuebuka, ọ bụ nnya kwụdịlị ụgwọ?" (Nekwa ajụjụ oo)
Kwụsị ajụjụ ee, ka ụmụ ụwa bịaba gị nso
Ajụjụ ị na-ajụ ka e jizi agbalụ gị ọsọ
Ọ jụọ m, "Ifeanyị na nwunye ya, ọ kwa fa na-ebi ọfụma?" (Nekwa ajụjụ)
"P-Square, Peter and Paul, ọ kwa fa bụ nwanne o?" (Nekwa ajụjụ)
"Precious Awka, asị na ọ na-agba ashawo?" (Nekwa ajụjụ)
Ị nọ main market, ajụ ife a zụlụ n'Alaba o (Nekwa ajụjụ)
Chei, nke ị jụlụ ajụ o, ka eji wee pịawa gị anya
Ajụjụ ị na-ajụ ka e ji wee tiwa gị anya
Chei, jụkata m, jụkata m, the thing ewewe mụ iwe
Ọ na-abụ ị jụkata m, jụkata m, ọdị m ka m tiwe gị eti
Chei, onye kpata ego, ị jụọ ma ọ na-atụ ọlụ (Nekwa ajụjụ)
Okolo bute ike, ị jụọ ma o gbulu nne ya (Nekwa ajụjụ)
Ajụjụ niine, ọ dị onye ga-aza gị ya? (Nekwa ajụjụ)
"Davido na Wizzy, ọ bụ onye ka agụ egwu?" (Nekwa ajụjụ)
"Messi na Ronaldo, ọ bụ onye kalụ nwee ego? (Nekwa ajụjụ)
Chei, ị fụ mụ na asa, ị jụọ m, "Ọ bụ asa onye?" (Nekwa ajụjụ)
N'afa Nna na Nnwa na Mmụọ Nsọ, maka Chi, ị jụgbue m oo (Nekwa ajụjụ)
Ife niine ị jụlụ mụ, ọ kwa mụ azabugo gị ya? (Nekwa ajụjụ)
Chei, ị fụlụ ọ dị ka ọ dị, jụba ya, "Ọ dị ka gịnị?" (Nekwa ajụjụ oo)
Gị ajụna, ajụna, ọ kwa ị mechalụ jụọ?
Ebe asị gị ekwuna, ekwuna, ọyị mụ mechalụ kwube oo
Chei, nga ntọọ, ile gị alapụtago gị o
Ụtalị mkpụlụ mmili, ọ kwa ya bụ mpịawa azụ?
Ife niine ị jụlụ mụ, ị ma na ị jụbugo m nya? (Nekwa ajụjụ)
Chei, onye ajụjụ ee, ị jụgbue m oo (Nekwa ajụjụ)
Ajụjụ niine ị na-ajụ, ọ bụ onye ga-aza gị ya? (Nekwa ajụjụ)
Chei, ọ jụgọọ m aka oo, ọ jụgbue m oo (Nekwa ajụjụ)
Ajụjụ niine ị na-ajụta, i ji ya esi ofe? (Nekwa ajụjụ)
Eewu Chi m eeyi, a jụgbuonụ mụ oo (Nekwa ajụjụ oo)
(Nekwa ajụjụ)
(Nekwa ajụjụ)
(Nekwa ajụjụ)
(Nekwa ajụjụ oo)
Written by: Okoye Onyeka favour
instagramSharePathic_arrow_out