Créditos
KOMPOSITION UND LIEDTEXT
Chibuzor Nelson Azubuike
Songwriter:in
Ifechukwu Greg Eze
Songwriter:in
Letras
Ọ sọ yị bulu ya gaba nkwọ, eji m ọfọ
Agbaa m uche na mkpọ, eji m ọfọ
Ị ma ka m si kwado? Eji m ọfọ
E sii m esi n'ọkụ, fa ama ka m si kwado?
Ebukwa m ji n'ụkwụ (Tinyenụ m n'egwu)
Fa chọlụ ka m malụ ife m menwuu, ebe m tolu n'Otus
Ị chọọ nkụwasị anyị kụwasịa (Tatawu)
Emelụ m ka a mata, na a gwọọ m, agaghị ata m ata
Fa che na obele gbanaa m see, bụ ife ga-agba m ara
Fa chọlụ ka m naba Onitsha, ka e jee mụba m ahịa
Mana ajụụ m ajụ
Fa chọọ ka isi m waa, waa, waa, ma isi m ekwerọọ awa
Ka nwoke naa, naa, naa, ma nwoke ekwerọọ ana
Fa chọọ ka ọkụ m nyụọ, nyụọ, nyụọ, ma ọkụ m ekwerọọ anyụ
Eji m ọfọ
Eji m ọfọ
Fa chọọ ka isi m waa, waa, waa, ma isi m ekwerọọ awa
Ka nwoke naa, naa, naa, ma nwoke ekwerọọ ana
Fa chọọ ka ọkụ m nyụọ, nyụọ, nyụọ, ma ọkụ m ekwerọọ anyụ
Eji m ọfọ
Eji m ọfọ
M mebe ofuma, kụọlụ m aka, nwa baby, kụọlụ m aka
Enyi m, kụọlụ m aka
Nwa chi ọbụbọ, kụọlụ m aka
Flashy, kụọlụ m aka
Okooko, kụọlụ m aka
Eze ụmụ, tụọlụ m asa, achọrọọkwa m ndị ga-agbajikwa m aka
Ọ dịka fa amụtago ịwa anya
Fa chọọ ịrakọ mụ na Onyenweanyị
O wee fa na anyị na-eme ife ka anyị
Oge elugo mgbe m ga-ewepụtalụ fa anya
Onye ọ na-ewe, one, one leg
Akpọ nọ na one, one, ten
Nnwa bụlụ fine, fine, girl, e golụ ya whole, wholesale
Fa chọọ ka isi m waa, waa, waa, ma isi m ekwerọọ awa
Ka nwoke naa, naa, naa, ma nwoke ekwerọọ ana
Fa chọọ ka ọkụ m nyụọ, nyụọ, nyụọ, ma ọkụ m ekwerọọ anyụ
Eji m ọfọ
Eji m ọfọ
Fa chọọ ka isi m waa, waa, waa, ma isi m ekwerọọ awa
Ka nwoke naa, naa, naa, ma nwoke ekwerọọ ana
Fa chọọ ka ọkụ m nyụọ, nyụọ, nyụọ, ma ọkụ m ekwerọọ anyụ
Eji m ọfọ
Eji m ọfọ
Ama m ama n'ama, ala na-agba m ala
Ebi m ebi n'ọfịa, achalụ ezigbo anya
Fa chee na obele asịlị a gbalụ fa ya awa m isi, mana akaa m aka
Ọ sọ gị, i kwuchaa, later, i metụ onye ị na-agwanụ aka
Ebu m isi ọkpụkpọ ya melụ fa ji ata m ụta
Ezege, efele nkụwa, mana adịrọọ awa m awa, maka akpọọ m akpọnụ (Akpọọ m akpọ)
All over the world, egwu a bụ egwu eji elinụ olili
Call me anything, but you cannot call me ofogiri
A pịasaa London, a land-ịa Lagos kpọnye ogidi, maka a lụụ ya alụ (Boy, a lụụ ya alụ)
Achọlụ m success
M mapụta express
A gụbulu m last, but now, a gụba, the boy dey come first
Ụmụ nnụnụ tụlụ atụlụ
Ladies jụlụ ajụlụ
Ama m na m gba nkịtị, fa ebunye m afịfịa ka m bụ atụlụ
So, m jebe ejebe, kụọlụ m aka
Ma m naba, kụọlụ m aka
Ifex pụta, kụọlụ ya aka
Ka ọ dọwa, kụọlụ ya aka
And onye machaa, a baalụ ya mba
O zuzuo, a tụọ ya ụtụ aka
Engine akwọọlụ ya ọka
Six to six, e jeelụ ya ụka
Fa chọọ ka isi m waa, waa, waa, ma isi m ekwerọọ awa
Ka nwoke naa, naa, naa, ma nwoke ekwerọọ ana
Fa chọọ ka ọkụ m nyụọ, nyụọ, nyụọ, ma ọkụ m ekwerọọ anyụ
Eji m ọfọ
Eji m ọfọ
Fa chọọ ka isi m waa, waa, waa, ma isi m ekwerọọ awa
Ka nwoke naa, naa, naa, ma nwoke ekwerọọ ana
Fa chọọ ka ọkụ m nyụọ, nyụọ, nyụọ, ma ọkụ m ekwerọọ anyụ
Eji m ọfọ
Eji m ọfọ
E sii m esi n'ọkụ
Fa ma ka m si kwado?
Ebukwa m ji n'ụkwụ (Tinyenụ m n'egwu)
Fa chọlụ ka a malụ ife m menwuu, ebe m tolu n'Otu
Ị chọọ nkụwasị, anyị kụwasịa
Written by: Chibuzor Nelson Azubuike, Ifechukwu Greg Eze